Ikemefuna ”Things fall Apart”

Ikemefuna ”Things fall Apart”

Ikemfuna bụ onye Mbaịnọ. Ndị Mbaịnọ ji ya na otu nwaagbọghọ kwụọ ụgwọ onye Ụmụọfịa ha gburu. Ụmụọfịa gosiri ugwu na nsọpụrụ ha nwere n’ebe Okonkwọ nọ wee kpọnye ya Ikemfuna ka ọ na-eleta ya anya ruo mgbe ha ga-eji ya mee ihe ha ga-eme. Okonkwọ kpọọrọ Ikemfuna kpọnye nwunye ya nke mbụ bụ nne Nwoye ka ọ na-azụ ya. Ikemfuna bụ nwata maara ihe nke ukwuu. Okonkwọ chọpụtara na o nwekarịrị nwa ya bụ…

Read More

Ịchụ Nta – Mbido Igbo

Ịchụ Nta – Mbido Igbo

Ịchụ nta bụ aka ọrụ a na-akwanyere ugwu tụmadi n’obodo nwere nnukwu ọhịa n’ala Igbo. Ịchụ nta dị iche iche. Ndị okenye na-achụ nta, ebe ụmụ ntakịrị na-achụkwa nke ha. Ndị Igbo na-akwado ụmụaka ịchụ nta ụmụ obere anụ dị ka ngwere na nnụnụ. Ụmụaka na-eji katapult were na-achụ nke ha. A naghị ekwe ka ha were ihe dị ka egbe, ụta ma ọ bụ mma. Naanị ndị okenye pụrụ i ji ihe ndị a…

Read More

Ọhaneze Ndị Igbo Akpọọla Òkù Ka A’hazigharịa Ọnọdụ Ala Nigeria

Ọhaneze Ndị Igbo Akpọọla Òkù Ka A’hazigharịa Ọnọdụ Ala Nigeria

Ndị igbo n’ụwa gbaa gburugburu na ndị ọzọ ọnọdụ ala Nigeria na-echu ụra akpọọla oku ka e nwògharịa ma hazigharịa ọnọdụ ala ahụ iji nye ya ezi ọdịnihu, kwalite ezi mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ọnọdụ udo, ọnọdụ mmepe, nakwa ọnọdụ egbe bere ugo bere. Ọkpọkpọ oku a, mkpebi a na nkwekọrịta a bụ nke e mere na nnukwu ọgbakọ izugbe a chịkọbara site n’aka otu Ọhaneze Ndị Igbo, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ ụbọchị…

Read More

Akuko Ifo… Akuko gbasara Ewu na Mbe

Akuko Ifo… Akuko gbasara Ewu na Mbe

IFOCHAKPI!!!!! Wool!! Umu nne m ekele kwa m unu niile ndi no n’ebe a Ama m na oru nke ubochi taa gara ofuma..Jehovah bu eze. Achoro m ina enwete akuko ifo nna nna anyi ha na okpako a ubochi Friday o bula. Ngwa ka anyi gerenu akuko ifo nke ubochi taa. IFOCHAKPI!!! WOO!!! Akuko a bu akuko gbasara Ewu na Mbe N’oge ochie mgbe uganu/aguru dara na obodo umu anumanu, nke ha ahughi tuturu rachaa,…

Read More

Gee nu nti na Okwaa di mkpa

Gee nu nti na Okwaa di mkpa

Ndị dibia bekee dị mmadu iri atọ na-atọ, sị mba Amerika bia, nọ n’Enugwu-Ukwu ugbua na-agwọ ndị mmadụ n’efu. Ihe ọwụwa (surgery/operation) ọbụla ka ha n’ahụ maka ya. Gị onye ọ dị mkpa, me ngwa kpọtụrụ ha tupu ha alaa. Ha nọ na General Hospital Enugwu-Ukwu. Kpọtụrụ Ada Igbo ( https://www.facebook.com/adaeze.nwankwo.79) ka ọ kọwara gị nke ọma. Ọ nụrụ kọrọ nwanne ya.

Read More

EKWULOBIA: Ihe nti na anuzi na anyi nti alo

EKWULOBIA: Ihe nti na anuzi na anyi nti alo

Mozan A Ezeiru: Chi boo anu ozo,  Otu nwa okorobia gbara afo iri abua na ato, bukwanu onye na akuzi mgbako na nwepu n’otu ulo akwukwo sekondiri, gara luru obere nwa nne ya nwanyi gbara afo iri na isii, na Agba, bukwanu nke di na EKWULOBIA, n’okpuru ochichi Aguata nke Anambra siteti. Maazi Chiadikobi Ezeibekwe, siri na obu Chineke ziri ya ozi ka omee etu ahu.  Na iji kwadoo aru ahu nwa amadi a bu…

Read More

AKUKO EGWURIEGWU ASO’MU MPI BOOLU

AKUKO EGWURIEGWU ASO’MU MPI BOOLU

NDEWONU NDI OMA N’ EGE NTI O kuo la elekere asato nke ututu, Ngwa gee nti nuru akuko uwa n’ uju ya: . Aha m bu nwaada Manchester United!  Itzdat Dopekid Juanpresh Futu boolu klobu nke di n’ SPAIN, a kporo Barcelona etiela ndi Futu boolu klubu nke di n’ England akporo Chelsea Alika-akwu😲 n’ abali nyaaaa bu 14:03:2018. . Ndi a bu ndi akporo Barca ji iwe were gba ndi a bu “the Blues” okpu…

Read More

Akuko Mike Ejeagha : Agba nke abuo

Akuko Mike Ejeagha : Agba nke abuo

Mazi Ibekwe agara gidim gidim bata n’ulo uka One Chance Salvation Ministry. Legharia anya o hughi Ikeagwu. O gakwuru onye no ebe ahu. “Kedu ebe Ikeagwu no?” O juo n’oke olu. “O no n’ulo ya.” Ocheghi ka o nu ihe ozo nwata nwanyi n’ako, o gbapu gawa na nke Ikeagwu. Iwe na onuma juru ya obi. “O kwa Ikeagwu?” O kwuo n’onwe ya, “Okwa mmuonso ahu tubara nwa m nwanyi ime? Ta ajo mmuo ga…

Read More

Akụkọ Mike Ejeagha. Agba nke mbụ

Akụkọ Mike Ejeagha. Agba nke mbụ

AMAKA…..Ogologo gbajie. “Kelechi Ọnụọha, agwala m gị hapụ m aka. Hapụ m aka….ọ gịnị dị.” “Amaka, bikozianụ. Nye m ohere, ka m gosị gị ọṅụ nke eluigwe.” “Achọghị m. Le m anya n’ọnụ, A-C-H-Ọ-G-H-Ị M. Kedụ ihe n’eme gị n’isi?” “Amịị, ihunanya abụkwanụghị ihe mmadụ n’ejidenwu aka. Ahụrụ m gị n’anya.” “Ihụnanya nke abalị atọ mụ na gị matara?” “Ọkwa i hụla ihe ahụ m n’ekwu. Agaghị m ejidenwu ihụnanya m n’ebe ị nọ aka.”…

Read More