ỊGỤ AHA NA ALA IGBO

Ịgụ Aha n’ala Igbo pụtara inye nwata aha, ma ọ bụ ịba aha, dịka ndị si asụ. Aha bụ ejirimara onye ma bụrụkwa ihe onye na-aza. Onye ọbụla na ihe ọbụla dị n’ụwa nwere aha e jiri mara ya, ma ndị nwụrụ anwụ ma ndị dị ndụ; maka na onye enweghị aha nọ ọdụ ka oke osisi enweghị akwụkwọ. Ọbụnadị ụmụaka a mụrụ ọhụụ nakwa ụfọdụ ndị a ka bu n’afọ nwechakwuru aha.

Ịgụ Aha n’ala Igbo pụtara inye nwata aha, ma ọ bụ ịba aha, dịka ndị si asụ. Aha bụ ejirimara onye ma bụrụkwa ihe onye na-aza. Onye ọbụla na ihe ọbụla dị n’ụwa nwere aha e jiri mara ya, ma ndị nwụrụ anwụ ma ndị dị ndụ; maka na onye enweghị aha nọ ọdụ ka oke osisi enweghị akwụkwọ. Ọbụnadị ụmụaka a mụrụ ọhụụ nakwa ụfọdụ ndị a ka bu n’afọ nwechakwuru aha.

N’ala Igbo, ọ kachasị n’oge elu bụ ala ọsa na oge a na-ebute ụkwa n’osi ụkpaka, bụ oge gboo; ọ na-abụ nwaanyị tụrụ ime, nwoke atụrụ echiche, ọ kachasị ọ bụrụ nwoke ọnọdụdịịrị añaa. Echiche ebe a abụghị naanị maka ihe a ga-eri, ihe a ga-eji zụ nwa, ma ọ bụ ihe nwaanyị na afọ ime ga-eje; kama otu ihe a na-echekarị n’oge ahụ gụnyere echiche aha a ga-enye nwa bịara ụwa ma o seputere isi n’afọ nne ya. E cheechaa maka nke a ga-enye ya ma ọ bụrụ nwoke, e chee maka nke nwaanyị, maka na ọ nwebeghị onye maara ihe ya bụ mbekwu gara afọ ga-azụta.

Ihe e ji ebido na gboo wee chebe echiche aha ahụ abụghị na nne na nna nwata ahụ apụghị inye ya aha ọbụla gbatara ha n’uche, kama ọ bụ maka ihi na ndị gboo ghọtara uru akpa agwụ baara eze dibịa ma ghọtakwa uru ọkpọntụ baara ụgụrụ. Ha ghọtara n’ezie na ọ bụ aha onye na-edu ya, maka na ọ bụ ihe onye kpọrọ nwa nkịta ya ka ọ na-aza ya. Ndị gboo ma uru ezi aha bara na ndụ mmadụ ọbụla, ihe aha onye pụtara, nakwa ihe aha onye pụrụ ibutere ya ma ọ bụ igbochiri ya n’ụwa ya. Ọ bụ ya mere ha ji echemi echiche ime, ma taakwa okwu eze tupuu ha agụọ nwata ọbụla aha, ka aha a gụrụ ya wee ghara iwetara ya ‘ị makwara me m eze ka ewu’ ma ọ bụ bụrụ ihe ọgbatauhie nye ya na ndụ ya.

Echiche na amamihe na-ejuputakwa n’aha ndị Igbo gụrụ mmadụ n’oge gboo ahụ maka na ha na-elechaa anya n’ihe mere na ndụ onye ahụ, ọ kachasị mgbe a dị ime ya; ihe mere na ndụ nne ma ọ bụ nna ya; ọnọdụ nwata ahụ n’ezinaụlọ ahụ, ihe a na-atụ anya ya n’aka ya; oge ma ọ bụ ụbọchị a mụrụ ya, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha na-elekwasị anya tupuu enye ya bụ nwata aha.
N’ụbọchị ahụ a ga-agụ nwata ahụ aha kpọnkwem, ihe mkpori na-ezo ka mmiri maka na a ga-eri ma ñụọọ gwoo gwoo. Ndị ezinaụlọ ahụ na-ezikwa ndị mmadụ ka ha bịa nọnyere ha ụbọchị ahụ, rie ma ñụọrọ, maka na òkù nwa enweghị iro. Ihe ndị a bụ nnọọ nke na-egosi na a kwadoro ya bụ ụbọchị nke ọma. Nke kacha nke bụ na a na-ekpekwa ekpere ụbọchị ahụ kelee Chukwu Abịama n’isi nwa bịara ụwa, ma rịọkwazie ya ka o mee ka aha nwata ahụ ghara ịbụrụ ya ihe ọgbatauhie n’ụdị ọbụla; kama, ka o si n’elu si n’ala wetere ya chi ọma.

Ṅ Nne na nna ga-eweputa aha izugbe a ga aba nwata ahụ, bụ nke onye ọbụla ga-eji mara ya. E nyechaa ya nke ahụ, nne ochie, nna ochie, nnukwu nne na nnukwu nna (n’otu n’otu) na-ewetakwa aha a ga-agụrụ ha nwata ahụ, bụ aha nke ha onwe ha ga na-akpọ ya. Onye ọbụla n’ime ha na-enyekwa nwata ahụ oke nkwụ ma ọ bụ nnukwu oke ọkụkọ, iji goro aha ahụ ọ chọrọ ịdị na-akpọ ya.

Dịka e si eme n’ebe ụfọdụ n’ala Igbo, a ga-akụkwa otu osisi n’aha nwata ahụ ụbọchị ahụ, dịka ugoro, akwụ, akị oyibo, ube, ụkwa ma ọ bụ osisi ọbụla ọzọ dị mma. Nke ahụ ga-abụ ‘osisi ala’ nwata ahụ malite n’ụbọchị ahụ. Iji ma atụ, ọ bụrụ akwụ, a ga-asị na ọ bụ akwụ ala nwata ahụ. Ọ bụkwa ya ga-enwerezị akwụ ahụ malite n’ụbọchị ahụ. Ya ga ewegidekwa ihe ọbụla mịrị na ya, ma o buo, rukwaa ụbọchị ọ nwụrụ. Ọ bụrụ na a chọghị ịkụ osisi, a ga-akpọkwasị otu osisi aha n’ụbọchị ahụ n’aha nwata ahụ, o wee sikwa otu ahụ bụrụ nke ya malite oge ahụ.
Ihe ndị a bụ otu e si eme ya bụ emumd ịgụ aha n’oge gboo. Ọ bụ ihe jọgburu udele na njọ ma sigbuokwa nkakwụ n’isi, ka ihe ndị a e jiri mara anyị bụ ndị Igbo sizị anwụnyụ anya ma na-efunahịzịkwa anyị. Ihe ndị ahụ niile bụzịkwa ihe anyị na-akpọdo isi n’ala ugbu a, wee na-emezị omenelu chee na anyị so n’egwu. A sị na onye ghara ikwe, ọ sụọ n’ala, maka na ọ na-abụ ụkpala na-ere ọkụ, o chee na ọ na-aha mmanụ.
Ndị Igbo ọgbara ọhụụ ugbu a na-emegharazị ihe ihu. Anaghịkwa emekebe emume ịgụ aha ma ọ bụ ịba aha n’ala Igbo ugbu a, ma ya fọdụzie inye nwata ahụ aha uche na amalihe dị n’ime ya. Ihe a na-amazị aka ya ugbu a bụ onye aha nwa nke nwa ya ga-akacha wee pụ iche ma ọ bụ wee da ụda na ntị.

Onye ọbụla na-achọzịkwa ka nwa ya zaa aha onye ọcha, nke ọtụtụ n’ime ha enweghị ike ịkọwa ihe ọ pụtara ma a sị ya kọwaa. E wee na-abàzị ụmụaka aha inyo, aha nkịta, aha nri, aha obodo, nakwa ọtụtụ aha ndị ọzọ uche na-adịghị n’ime ya; naanị ka e wee sị na nwa ya na-aza aha oyibo, aha onye ọcha ma ọ bụ aha pụtara ọhụụ.

A bachazie nwata aha nzuzu ndị a, ọ na-ezuzugharịzị dịka aha a kpọrọ ya siri dị; maka na ihe onye kpọrọ nwa nkịta ya ka ọ ga-aza. A naghị agharakwa n’ikwe sụọ n’ala ghara ịsụta aja. Ndị Igbo anaghịzị eji asụsụ Igbo aba ụmụ ha aha ma ọ bụ nye ha aha Igbo gbakwasịrị ụkwụ n’ihe mere na ndụ onye ahụ ma ọ bụ ọnọdụ ya na ihe gbasaara ọdịnihu ya.
N’oge gboo, ị ga-anụ aha dịka: Chijindụm, Chizaram, Anọchie, Okeke, Okafọ, Nwankwọ, Nwaanyịafọ, Chiziterem, Nnabụugwu, Chikamso, Mmadụabụchukwu, Chinenyenwa, Nkiruka, Ọdịnakachukwu, Ahamefuna, Ndidimaka, Chinụalụmọgụ, Chikwuorom, nakwa ọtụtụ ọmarịcha aha ndị ọzọ dị otu ahụ.
Mana oge ugbu a, naanị ihe a na-ahụzị bụ: ‘Chi-boy’, ‘Ebony’, ‘Martin’.’Robinson’ ‘ Nancy ‘Jefferson’ ‘Robertson’, ‘Nancy’ ‘Bridget’ ‘Jennifer’ Priscilla, Princess, Rachael, Tina, Cynthia, nakwa ọtụtụ aha ndị ọzọ dị otu ahụ, bụ nke na-enweghị ihe ọbụla ọ pụtara, na-abụghị naanị maka na ndị ọcha na-aza ya dịka aha. A na-ekwu na ọrịa ezughị okè, onye ịba a na-etokwu afọ. Onye sị sị kpụọ ya isi a kpụrụ nwa Mgbeke, ọ makwa na isi ya na nwa Mgbeke abụghị otù?

Ndị be anyị, ọ bụ ihe ọbụla anyị hụrụ ndị ọcha na-eme ka anyị ga-amụrụ sokwa ha mebe?? Ha onwe ha ọ na-asọkwa nsọ ịmụrụ nke anyị laa na be ha ga mebe?? Ka ọ bụ sọ mmụrụ ka anyị na-amụrụ?? Anyị chọchakwa ihe ndị anyị ga-amụrụ n’aka ha, ọ bụrụ ndị enweghị uru ọbụla ọ ga-abara anyị?

Doo ndị be anyị ka anyị laghachinụ azụ n’ebe anyị si, bụ ihe ndị ahụ e jiri mara anyị, ka nke anyị wee dịrị anyị. Ọbụnadị ụmụ agbọghọ anyị ndị na-akpacha anya ha gbanwee ezigbo aha ọma Igbo nne na nna ha nyere ha, ma zabazie aha ndị ọcha, sị na nke Igbo na-eme ha ihere; doonụ ka onye ọbụla selata aka ma sepu mma na akịdị maka na e jighị mma eri akịdị. Onye tụfuru aha ya nọkwa ọdụ ka onye bara kọrọ n’isi. Onye kpọọ ọba ya ọkpọkọrọ, agbatpobi ewere ya kpoo ntụ. Onye a gwara kwe, a hụ ọzọ, a gwakwa ya. Mana onye agwara agwa ma ọ nụghị anụ , o mee emee, ọ hụ ahụ; maka na nwata a na-akpọ oku n’ụlọ ọ na-agbakpu ọhịa ga-emechakwaa mara na ọhịa abụghị ebe oboibi.
Ndewonụ.

Ezekwụeche Na Abatete=
Facebook Comments

Leave a Comment