ỤMỤ NWAANYỊ AFRỊKA NA NTUTU ISI HA

ỤMỤ NWAANYỊ AFRỊKA NA NTUTU ISI HA

Related Post

  • No related post.

Ọ dị ka ụmụnwaanyị Afrịka aka hụ ntutu nke ndị ọcha n’anya karịa ụdị nke Chukwu nyere ha. Nke a bụ maka na ọtụtụ ụmụnwaanyị Afrịka na-eji akụrụngwa dị iche iche a na-akpọ ‘Relaxer’ na Bekee wee na-ete n’isi ha ka o were gbatịa dị ka nke ndị ọcha. Ọtụtụ ndị mmadụ ajụọla ihe kpatara ha jiri hapụ ọmarịcha
ntutu Chukwu nyere ha jiri akụrụngwa kemịkal na-ete na ya. Ha jirichaa kemịkaal ahụ, ha arịgọọ ya ka ọ gbatịa dịka nke ndị ọcha.

LEE IHE HA KWURU

Ihe mere anyị ji eghe ntutu anyị eghe

1. Ọ na-aka ama mma ma e gheesịa ya eghe: Ha kwuru na ntutu ha na-aka enwuke enwuke ma e jiri kemikaal ghee ya. Nke a bu maka na ha kwuru na ntutu ndị Afrịka na-adị ka ihe churu echu

2. Ọ na anwụla anwụla dị mfe ijikọ: Otu ihe e ji eghe isi bụ na e ghesịa ya, ọ nwụlaa, ọ gaghịzị adị ike etu Chukwu si kee ya nke mere dịka ha si kwuo, ọ na-akara ha mfe ijikọ maa mee etu ọbụla ha chọrọ

3. Ntutu anyị na-afụ ụfụ: Ụmụnwaanyị kwuru na ha anaghị etinyeli mvọ n’ime ntutu ha ma ọ bụrụ na ha eteghi ya ihe maka na o siri ike nke
ukwu, mana kemikaal na-eme ya mfe ivọ

4. Ọ na-adị mfe ịsa mmiri: Ha kwuru na ha nwaa anwa wụọ ntutu ha mmiri ma egheghi ya eghe, ọ na-adị ka ogbo, ọ naghị ekwe ọsịsa gụnyere na ọ na-eri mmiri ma na eri ncha. Ha kwuru na ha nwereike ịnọ elekere abụọ maọbụ
atọ ebe ha na-asa isi mana ha ghee ya eghe, ọ naghị egbu oge

5. Ịkpa isi anaghị arịa ahụ ma na aka anọ ọdụ: Ụmụnwaanyị kwuru na ọ bụrụ na ha egheghi ntutu ha eghe, ha kpasịa isi, ọ naghị anọ ogologo oge, ọ kaa ma na ọ bụrụ na ha ghee ya eghe, ha ga-ebu otu isi ha kpara ma butee ya aka

6. Maka na ndị ibe anyị ghere isi ha: Ụfọdụ n’ime ha kwuru na ọ bụ ndị mmadụ kwanyere ha n’ighe isi.

Ihe ha kwuru nwereike inwe isi mana ụmụaanyị amakwa ụdị ihe e ji eme kemicaal ahụ ha na-awụnye n’isi na ihe ọ na-eme n’ahụ ha?

LEE IHE KEMIKAAL ‘RELAXER’ NA-EBUTE

1. Ndị na-eme nyocha kwuru na ụdị akụrụngwa siri ike e ji eme ya nwereike imeru ndị na-etinye ha n’isi ahụ.
2. Ndị na-eji ya bụ ‘relaxer kwuru na ha chọpụtara na ntutu ha na-achagharị ma ha gaa n’ihu na-etinye ya ọtụtụ afọ

3. Ọ na-eme ntutu adapụsịa: Agbanyeghi na ntutu ndị Afịrịka na-eju eju, kemịcaal ‘relaxer’ nwereike ime ntutu adapụsịa.

4. Ọ na-ericha ntutu site na ịgba ndị mmadụ ọkụ n’isi: Ụfọdụ ndị anyị gbara ajụjụọnụ kwuru na ụfọdụ oge, ntutu ha richara site n’ụdị ‘Relaxer’ ha tinyere maọbụ nke bara ha ọnya n’isi.

Nchọpụta a ka na-enyocha enyocha kwuru na ndị na’eghe isi ha oge ọbụla nwereike inwe akpụ ara kansa ọsịsọ karịa ndị na-adịghị eji ya

Ya bụ onye ọ bụla rie adụ dụa onwe ya

Facebook Comments

Leave a Comment