Dr. (Mrs.) Ngọzi Okonjọ-Iweala

Ngọzi Okonjo-Iweala bụ Nwaada Igbo. Ọ so na ndị na-ewu ewu na Naịjirịa. Ọ bụ onye Ọgwashị Uku dị na steeti Delta ma ọ lụrụ di n’ụmụahịa dị na Steeti Abịa. Aha di ya bụ Ikemba Iweala.

Aha nna ya bụ Prọfesọ Chukuka Okonjọ, Eze ma ọ bụ Obi na-achị Ọgwashị-Uku. A mụrụ nwaanyị a na 1954. Ọ mụrụ ụmụ anọ. Ngọzi gụrụ Ịkọnọmiks(Economics) na Mahadum Harvard dị n’Amerika ebe ọ nọ turu ugo na 1977. O nwere nzere Ph. D.

Ngọzi Okonjọ-Iweala so ndị anaghị agbagha okwu ha na Naịjirịa. Ọ bụ ya bụ Minista na-ahụ maka ego (2011 ruo 2015). Na 2006, ọ bụ ya bụ Minista na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ.

Na mba ụwa, Ngọzi sokwa nwee ọnụ okwu. Na 2007, e mere ya onye nlekọta n’ụlọakụ Mbaụwa. O nwekwara ọtụtụ nzere nkwanye ugwu. Ọ bụ ya dere akwụkwọ ndị a:

Chinụa Achebe: Teacher of Light(2003)

The Debt Trap in Nigeria: Towards a sustainable debt strategy(2003)

Reforming the Unreformable: Lessons from Nigeria(2012)

Ngọzi Okonjọ-Iweala na-asụ asụsụ ndị a: Bekee, French, Igbo na Yoruba. Nwaada a kwesịrị i bụ onye ụmụ agbọghọ kwesịrị ị dị na eñomi ma ọ bụrụ na ha ga ahapụ nlecha juru ụmụ agbọghọ ọgbara ọhụụ a ahụ!

Facebook Comments

Leave a Comment