Akụkọ N’egwu(Mike Ejeagha), Akụkọ Mbe na Enyi

Ka E Si Lee Onyeisi Oche

Nna m Eze apata m enyi
Nna m Eze apata m enyi
Ị sị na ị pata onye?
Ị sị na ị pata onye?

A sị m anị ya dube enyi chebe enyi
Ọ dị ka m sị na a pata m enyi
A sị m anị ya dubere anyị enyi
Chebere anyị enyi,

Ọ di ka m sị na a pata m enyi,
Ọkwa enyi ga-abụ onyeisi oche
Ọkwa enyi ga-abụ isi oche
Enyi na a gaa na m so gị n’azụ
Enyi na a gaa na m so gị n’azụ
Gwogwogwo m gwo!

Akụkọ N’egwu a bụ nke ọtụtụ anyị mara nke ọma. Adaeze jụrụ na ọ gaghi alụ di niile na a bịara ya. Eze jụkatara ya ihe kpatara ya. Ọ wee sị na ọ chọrọ ka onye ga-alụ ya kpụta enyi

Ka mbe chọpụtara nke a, ọ jee gwa enyi na eze ga-agba ọfala. Nke ọzọ bụ na eze mere ya onyeisi oche. Ka ụbọchị akara aka ruru. Mbe na enyi wee malite njem n’ụlọ eze. Mana mbe dị ka chi ya siri kee ya na-akpụ akpụ.

Nke ekweghị enyi edi. Maka nke mbụ, ha malitere njem ahụ n’oge ehihie. Uche ya bụ na ha nwere ike ha agaghị elu gboo. Ọzọ bụ n’ọnọdụ ahụ e nyere ya dịka onyeisi oche tọrọ ya ụtọ nke ukwuu. Ọ chọghị ka akọrọ ya akụkọ na ya.

Ọ wee na-abara mbe mba ka ọ na-agasị ike. Mana mbe gwara ya nyere ya aka site n’ime ka ọ nọrọ n’elu ya, ka njem ha wee dị ngwa ngwa. Enyi agbaghaghị ya ma ọlị. Ka mbe chọrọ ị rịkwasị, ọ gwakwa enyi na ọ gaghị enwe ike
Naanị ma ọ ji eriri nyanye ya n’olu, nke ga-enyere ya aka rịkwasị ya n’azụ. Enyi gwara ya nke ọ bụla ọ na-eme, ya mee ọsọ. Mbe mere, wee rịkwasị ya n’azụ. Mgbe ahụ ka nkata ọ kpara chịkọtara ọnụ.

Ha na-aga, mbe a na-agụ egwu na ọ patala enyi. Enyi jụọ ya ihe kpatara isi egwu ya ahụ, o tobe ya otuto. Ọ bụ ihe a ka ha megidere ruo ụlọ eze. Mbe ewere eriri nyefee eze n’aka. Ọ wee bụrụ na-elera onyeisi oche.

Ihe mmụta dịka onye nwe akụkọ n’egwu a sịrị kwu: enyi gị sị gị dụga ya ozi. Uche gị dị ya.

Ka e mesịanụ.

Facebook Comments

Leave a Comment