Anu’m di na nwunye, ugboa na gboo

Mgbe mbụ na ala igbo ọ na abụ nwọke hụ nwanyị ọga alụ ọkpọtara ya Nne na Nna ya ka ha hụ ya anya, mgbe ha hụchara ya, ha ga ajụ nwata nwanyị ahụ ajụjụ gbanyere obodo ya na ndị be ha.
Mgbe nke a gachara Nne na Nna nke nwọke ga ajụ nwa ha nwọke ajụjụ banyere nwanyị ahụ ọchọrọ ịlụ, emechaa Nne na Nna nke nwọke ga atụ elo zije otu ọnye ụmụnna ha ma ọbụ ọnye ezi n’ ụlọ ha ka ọgaa n’ obodo nke nwanyị si na ya wee pụta jee jụa ese banyere ezi n’ ụlọ ahụ, etu ha si eme, ụdị ndụ ha na ebi, ọ nwere ajọ ihe na eme ebe ahụ, nke a gachaa ọnye ahụ ga alaghachi azụ jee kọọrọ ọnye ziri ya ozi etu osiri wee ga, ọbụrụ na ihe banyere ha dị mma ịmarụ na aga ezi ozi ka aga gwa ndị be nke nwanyị na ngwugwu ahụ ekechiri n’ olugo ka aga atọpe ya
Etu a ka ndị be nke nwanyị ga esikwa wee mee.
Mana ugbua ọdịghịzịkwa etu ahụ, nwanyị achọghịzị ịjụ ese etu a ka ọdịkwa n’ebe nwọke nọ ihe ha ma bụ na ha hụrụ ọnwe ha na anya ọwee bụrụ ihe jọgburu udele ma sikarịa ṅkakwụ n’isi. Ihe ndị a so na ihe so ebute nsogbu na alụ m di na nwunye n’ụbọchị taata.
N’ ikpeazụ ndị be anyị tụrụ ilu sị gị bido n’ oge chụwa ewu ojii tupu chi a na eji, ekwukwara okwu sị na ajụghị ajụ kpatara arịaghị agha wee nwụọ. ka ọha m etu a.
ỌBỤRỤ NA ỌNWERE IHE ỊNWERE IKWU I KWUO YA KA NDỊ ỌZỌ WERE SIKWA NA YA MỤTA IHE. ỤMỤNNAA ỌGWỤNỤ M KA ỌHA M N’ ỌNỤ.

Facebook Comments

Leave a Comment