MGBA N’ALA IGBO

Okonkwọ na Ọmalinze

Mgba bụ otu n’ime ihe egwuregwu ndị Igbo nwere. Mgba na-eme ka mmadụ gbasie ike. Maka na nwoke na ibe ya ha bụ n’ọnụ, e ruo n’omume a mara mbe abụọ nke bụ oke.
E ji mgba asọ mpi enyi ma ọ bụ mba na mba n’oge gboo.

E ji ya enwe mmekọrịta mmadụ na ibe ya. N’ime akwụkwọ Ihe a gbasara nke bu (Things Fall Apart), Okonkwọ na Ọmalinze gbara mgba. Ọmalinze bụ Nwamba Azụeruala ebe Okonkwọ bụ anụ kpọrọ nkụ na-eju ọnụ.

N’ime mgba ahụ, Okonkwọ na Ọmalinze bụ atakataagbọọ. N’ikpeazụ, Okonkwọ tụrụ Ọmalinze n’ala. Ụzụ ewe fịọ ebe niile. Nke a so n’otu ihe mere ndị Ụmụọfịa ji akwanyere Okonkwọ ugwu, mekwa ka ọ bụrụ dike ha ji aga mba.

Mgba bara uru n’ala Igbo.
1: E ji Mgba eto ọgbọ, ya bu I ma onye tọrọ Ibe ya makana ọkpụkpụ okenye na eyi ka mma.

2: Ejikwa mgba ama onye ka ibe ya ike.

3: Mgba bukwa ihe eji anụ nwanyi n’obodo ụfọdụ dika ihe anyị na-afụ n’ihe onyonyo.

4: Mgba na-eme ka ụmụ ntakịrị gbasie ike, ọ kachasị ụmụ nwoke.

DAALỤNỤ!

@Uzobuenyi

Facebook Comments

Leave a Comment