EKPERE UTUTU, OBOLO CHI KELEE CHI

Ọ bụ n’aha Nna, na nke ọkpara, na nke mmụọ nsọ, amen.
Chineke pụrụ ime ihe niile, onye ebere na onye obi ọma, anyị bụ ụmụ gị a biakwana n’ilu gị n’ụbọchị taata. Anyị bịara ịkene gị n’ihe ọma niile nke ị meere anyị, anyi na-ekene gị ka ị sị mee anyị bụrụ ndị dị ndụ n’ala ndị dị ndụ n’ụbọchị taata. Anyi na-ekene kwa gị maka ogologo ndụ n’ahụ isi ike nke ị nyere anyi. Nna, nara ekene maka ezi n’ụlọ anyị dị iche iche, ndị enyi na ndị ọgọ anyi, chukwu ọma anyi na-ekene kwa gị maka ikwu n’ibe anyị dị iche iche. Anyị na-asi ka-ekene niile, ọjịja mma niile, nbunyi elu niile na nsọpụrụ niile bụrụ naanị nke gị n’aha Jesus, amen.

Chukwu onye ebere, anyị emehiewo megide gị n’ụzọ dị iche, site n’echiche, n’okwu, n’omume, ma sitekwa na ị rapụ ezi omume kwesịrị na anyị ga-eme, anyị na-arịọ gị nna ka i meele anyị ebere, gbaala anyị njọ niile, Nna sụchaa anyị dị ka ákwà ka anyị dị ocha.

Chukwu Okike, anyi na-ewere ụbọchị taata tinye gị n’aka, Nna, nọnyere anyị n’ ọpụpụ na mbata anyị. E kwekwala ka anyị zute ihe ọjọọ ọ bụla n’ụzọ n’ụbọchị taata. Gọzie aka ọlụ anyị niile ma nyekwa anyị aka nchawa n’ihe niile anyị ga-eme taata. Chukwu anyị na-arịọ gị ka ụbọchị taata bụrụ anyị ụbọchị aka ngọzi ngozi.

Anyị na-ebute kwa obodo ànyị bụ Naijiria n’iru gị, anyị na-arịọ gị ka ị nye anyị udo n’ọganihu, gozikwa ndị ọchịchi anyị nye ha amamihe ka ha wee na-achị anyị nke ọma.

Chukwu mụọ nsọ bia bụrụ onye nhazi n’onye ndu anyị n’ụbọchị taata. E kwekwala ka anyị gahie ụzọ,nye anyị amamihe ka ihe niile anyị ga-eme taata bụrụ ihe ndị ga-enye Chukwu otito. Chukwu mụọ nsọ nye anyị mụọ nke ebere, udo n’ịhụnanya ka anyị wee mee uche gị n’ihe niile anyị nwere ime n’ụbọchị taata. Ihe ndị a niile ka anyị na-arịọ gị n’aha Jesus Christ bụ onye nwe anyị, Amen!

Facebook Comments

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

WP2FB Auto Publish Powered By : XYZScripts.com