Ilu Igbo: Ilu iri abua gbasara nkwenye na ofufe n’ala Igbo

Nkwenye ,ofufe na echiche miri emi ndi Igbo nwere putara ihie n’ilu ha na atu,iji gosi nkwenye na ofufe ndi Igbo si gbaa mkporogwu,ha na eji ilu ndi a ekwu okwu

1. Nkita si na ya agaghi eji ujo ogu ya na ndi mmuo hapu ihe a tupuru n’ezi

2. Ojukwu na azo mmadu ngwu ana egbu ya.

3. Onye meruo ala,ala achuo ya osoo

4. Onye kariri mmadu kariri chi ya.

5. Dike gawa ogu hapu ikenga ya,azu eruo ya ala.

6. Chi mmadu adighi n’izu onwu anaghi egbu ya.

7. Ebe onye dara ka chi ya kwaturu ya.

8. Ekwe agaghi akute onye ala ji.

9. Nze sara ire anaghi eme nso ala 

10. E buru onu na agba afa o na ada onwu onwu .

11. Onye ji ofo nna ya anaghi atu egwu.

12. Chi nyere nwa ogbenye ji ga enye ya mbazu o ga eji gwuru ya.

13. Onye mere ihe Igwe na atu egbe Igwe egwu .

14. Nwa nza rijuo afo o kwere chi ya mgba .

15. a na achu aja ka ikpe maa ndi mmuo.

16. onye mebe ivedi ya bido ala aka ka o ga abu o dawa daruo n’ala,ala aghodo ya ,ochiooo.

17. mmadu anaghi ekwe Chi ya ndo.

18. Onye chi ojoo ka mmiri na afanye n’eze.

19. Okuko nyuo ahuru ala achuwa ya oso.

20. Achuo aja ma afughi udele, imara na ihe mere na be ndi mmuo

Facebook Comments

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

WP2Social Auto Publish Powered By : XYZScripts.com