Akuko Ifo… Akuko gbasara Ewu na Mbe

IFOCHAKPI!!!!! Wool!!

Umu nne m ekele kwa m unu niile ndi no n’ebe a
Ama m na oru nke ubochi taa gara ofuma..Jehovah bu eze.

Achoro m ina enwete akuko ifo nna nna anyi ha na okpako a ubochi Friday o bula.

Ngwa ka anyi gerenu akuko ifo nke ubochi taa.

IFOCHAKPI!!! WOO!!!

Akuko a bu akuko gbasara Ewu na Mbe

N’oge ochie mgbe uganu/aguru dara na obodo umu anumanu, nke ha ahughi tuturu rachaa, Ewu na Mbe bu nnukwu enyi nke mere na ha abuo bu ahughi ebula si elila dike. Enwekwara Otu nwoke umu nna ya chupuru achupu na obodo ha o nwe gaa na obodo umu anumanu binyere ha.
Nwoke a bu otenkwu na ogbu nkwu, o dighi mgbe isi akwu na mmanu na ako na bee ya, niihi nkea Ewu na enyi ya kpebie na ha ga aga ohi na bee ya.

N’otu ubochi orie, n’uzu ututu ubochi orie ahu, nwoke a aha ya bu Nwaemecheta nwee buru ufodu mmanu ya na aku gaa orie amaraako ka ore ha.

Mgbe chi na eme, o bu Onye, o bu Onye?
Ewu na Mbe amipu gaa na nke nwaemecheta, mgbe ha ruru onu uzo ulo nwaemecheta mere mgbachi, ma enwere Otu mpio di na ukwu aja mbara ezi ya ebe umu okuko ya na anu ndi ozo onwere si epio banye ma ha gachaa ukpa nri na ezi.
Na egbughi oge o bula Ewu na Mbe esi ebe ahu piobanye na mbara bee nwaemecheta.

Ozigbonje ha banyere ha huru otutu isi aku chara acha, ha malitere tawa ya n’ike n’ike
Ma Otu Mbe si di ahuho, otatu akwu tatu akwu, o ga lee ma afo ya o ga agafekwa na oghere ahu ha siri nwee bata na mbu.
Mgbe Ewu choputara etu Mbe si na apu, na abata, o juru ya ihe o na eme, Mbe Zara ya si, na ya na aga efichabilata mmanu di ya n’onu, otegizi aka Onye nwe ulo abata.
Ewu na Mbe wara oso n’egbughi oge o bula, Mbe si na mpio ahu ha siri bata mipu, ma afo ewu ekweghi ka ewu gafere n’oghere ahu.
Onye nwe ulo nwe jide Ewu manye ya ogburi n’olu, hapu ya n’ulo ya.
O bu niihi njide a Nwaemecheta jidere Ewu ubochi ahu ya na enyi ya Mbe biara ohi akwu na bee ya mere na umu mmadu na Ewu malitere biwa n’otu mbara ruo taa.

IFOCHAKPI!

Facebook Comments

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

WP2Social Auto Publish Powered By : XYZScripts.com