Ilu Igbo…. Ilu Ndumodu Iri Abua (20)

Dika Igbo si kwuo.. Ilu bu uto Asusu igbo, Ilu bu mmanu igbo ji eri okwu.. Nwafo Igbo obuna kwesilu ima ka esi atu ilu ma nwekwaa ezi nghota ebe ilu di.

Ilu Igbo na akowa otutu Ihe, Ona adu ndumodu, ona ekwu maka mmekota, ihunaya, enyi, mmewa obi dgz.

Na Ilu Igbo nke taa, anyi ga atuputalu unu ilu ndumodu iri abua.

  1. Chuo ewu ojii mgbe ihe ka di.

  2. Mmiri doro na eju doro nwa nkita.

  3. Okuko anaghi echefu onye foro ya odu na udu mmiri.

  4. Atualu nwa omara omara, mana atualu ofeke ofenye isi n’ohia

  5. Echi di ime onye ma ihe oga amu

  6. Nti ganu ihe abughi ma ohaka okpu atta

  7. Aka aja aja na ebute onu mmanu mmanu

  8. Ngwere gbaba oso gbahara ukwu osisi aka akpara 

  9. Onye bulu chi ya uzo, ogbagbuo onwe ya na oso

  10. Ukwu na ga wara wara anya na ga wara na ahu ya

  11. E mee ngwa ngwa, e meghara odachi

  12. Oke soro ngwere maa mmiri, okochaa ngwere oga akokwa oke? 

  13. Wepu aka enwe na ofe tupu oghoro aka mmadu

  14.  Ihe okenye tukwu n’ ana hu, nwata rigodi enu oji, ogaghi ahu ya

  15.  Nwata na ta akara na eri ego ya

  16. Agbusi gbaa otele omuru ako

  17. Agha akaraka adighi eri ngworo

  18. Anaghi asi ochi nki na agha esu

  19. Ukpana okpoko gburu, Nti chiru ya

  20. Nwata kwochaa aka, osoro ogalanya rie

Facebook Comments

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

WP2Social Auto Publish Powered By : XYZScripts.com