Edemede maka Ezinne

Nne!

N’ezie, kemgbe ndi Ezinne OSNI siri anyi dee edemede kam no na-aju onwem ihem ga-ede. Mbanu! Obughi maka nam enwero ihem ga-ede kama n’obu n’ihi na ihe gbasara Nne n’uwa niile di omimi! Ma dikwa okpu!
Ya bu na-onweghi ihe mmadu ga-edekete ebea ga-ekpokotanwu ihe gbasara Nne onu!
Naani nam bu nwanyi buuru m ihe omimi ma ya buruzia mgbem buru nne! Choi!
Ezie, odi egwu ma dikwa omimi!
Ma ya diba!

Eee! Obu ihe doro anya na nne bu nwanyi obula murula nwa mana achoro m ichetara anyi na nne bukwuazi nwanyi obula nwere nwa ona-elokota anya ma obu ya muru ma obughi ya muru.

Ebe anyi marala nkea, oga-adimma imata onye bu Ezinne n’ezie.

Ezi nne bu nwanyi obula kwadoro nke oma tupu obanye ilu di. Nke mbu bu iji Chineke wee yiri isi ma mere mgborogwu! Nkea bu maka na oga-ebu uzo buru nne di ya tupu obia buru nne umu ya. Nya bu na Di ya bu nwa ya nke izizi.
Ezi nne bu nne nwere anya ala ma di ume ala imata n’obu ya bu na-ezinulo ya gaa n’iru. Nkea bu maka n’umuaka n’ebu uzo amara nne ha tupu ha amara nna ha. Nya bu na ndi Ezi nne bu ndi ana ewukwasi ezinulo obula n’isi.

Anaghi agwa onye bu Ezi nne ihe di mma kwesiri ka-emee n’ezinulo n’ihi na omarala ihe okwesiri ka omee we wulite ezinulo ya na agwaghi ya agwa.

Eji inwe obi nne mara onye bu Ezinne. Nkea bu nke o n’egosiputa ebe di ya na umu ya no.
Ezinne mara obi di ya ma mara ihe di ya nwere ike imenwu. Obukwuazi nne n’ebi ndu nke umu kwesiri iñomi. N’ihi n’obu ezigbo ezinulo n’ebute ezigbo obodo.
N’aka nke ozo, Ezinne bu nne matara n’enyemaka ya bu nke di ezigbo n’ezinulo n’ihi nkea ka oga-eji enwe aka oru ma obu oru ona-aru iji nyere nna nweulo aka n’ikwalite ezinulo. Nkea gbadoro ukwu na ihe ya na di ya kwekoritara maka n’enwere ezinulo n’ekwekorita na nwunye ha agaghi aru oru kama n’oga elete ulo ha anya naani! Anyi amarala na ibu ihe ndi bekee kporo “house wife” abughi egwu achi utaba na-aka agba! Umu nwoke unu si n’odi mfe, unu anwanu kanyi fu!
Oem!
Ezinne anaghi eji afo ezinulo ya egwu egwu! Ha na afu na nri di mgbe okwesiri idi ma dikwa n’udi kwesiri.
Ezinne bu onye ndo (shade) ezinulo, ya mere na ha bu ndi mkpokota na abughi ndi ntisa!

Eee! Onye ezinne obula kwesiri ibu ihe njiko diri ndi ezinulo ya na ndi be di ya na ndi ohaneze. Ya mere, obu onye kwesiri iji udo na idi n’otu yiri isi.

Dika m si kwu na mbu, ihe gbasara ndi nne okachasi ndi Ezinne bu ihe di omimi ma karia akaria nke bu na ulo oba akwukwo agaghi ekpokotanwu ya! Ma ya foduzia mgbe asiri anyi dee okwu otu narii nani! Odi gi ka obu ihe g’ekwe omume? Mbanu!
Ya mere ka m jiri akwukwo Ilu iri ato n’otu, site na-amaokwu nke iri ma rue na nke iri ato na otu! (Prov31:10-31) wee piachie edemedem a…jee k’iguo ya ma tinye ya n’uche. Ezie, ebea ka akowara ihe Ezinne putara nke oma. Ka Udo diri anyi niile!

Ndi Nne maanu mma ooo!
Unu wu dachiiiiiiiii!

#Tara bonsu mu puba#

Odee Bu Joan Chichi Onah

Facebook Comments

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

WP2Social Auto Publish Powered By : XYZScripts.com