OLE NDI BU NDI IGBO

OLE NDI BU NDI IGBO
Obodo m Igbo bu obodo udo
Gini kam geme ka udo ya dikwa
Agam eto nime udo ya
Na omenala n`ukpuru oma ya nile
Aga m asopukwara ndi okenye.

Akam abuo, dika nke ndi muru m
G`alusi olu ike iluputa ihe m geri
Echiche mgeche nani ihe oma
Ime ka madu ibem ba uru, e,
Ime ka madu ibem ba uru.

Umu ntakiri bu onyinye diri Igbo
Obukwa ihe oma nke oganiru
O ganiru obodo dabere n`umuaka ya
E,oganiru obodo dabere n`umuaka ya
N`ihi ya agam eme k`obodo m ga n`iru.

Otutu obodo di iche iche dikwa n`okpuru owuwa anyunwu. Ala m, bu ala Igbo sokwa n`otu nime ha. Ala nile ndia mara nma, ma ala m makarisiri ha na nma. Dika unu noduworo ala, nyenu mu nti unu, mgbe nga akosiri unu akuko m, unu gekwe nezie n`ala m kacha nma.
Ndia mu naga ikoro unu bu ndi Igbo, obodo oma nenweghi atu n`ihe oma, nke amukwaram nime ya, bu otu nime obodo uku onye kere uwa kekwara.
Otutu ihe kam g`akoro gi ebea nke mere ojiri pua iche, ma nke mere oji guzoro iche n`anya oha ndi ozo dika olu Ele bu omaricha asusu ya nke onweghi nke dika ya na uwa nile.
Ebe obula ahuru madu n`uwa a, otu ihe negosi odi iche ha nebe ndi ozo no bu asusu ha. Obu na asusu ka Igbo ji di iche karisia na ebe mba ndi ozo no. Ihu na otu madu di anaghi akowacha ebe osi bia dika asusu si akowa. Obu asusu Igbo nke bukwa opuru iche mere nwa Igbo obula nebe obula n`uwa eze.
Ebe obula nwa Igbo no sua asusu, iga ama n`obu nwa afo Igbo. Oburukwari na ino ebe di anya nu olu iti mkpu onu m`obu akwa nke Igbo, iga ama. Na iji ma atu: “Igbo kwenu, (i-yee) kweneu (i-yee) kwenu (i-yee) kwezuonu (i-yeeee)
Ndi okenye Igbo, ndi kataworo ahu na eji udi olu nkpokota a agozi umu Igbo ndi na ana ha nti mgbe ha n`ekwu okwu. Otua: “Cha, cha, cha, cha Igbo tuonu! (i-yee) muonu! (i-yee) zuonu! (i-yee) rienu! (i-yeeee)”
Nkea bu otu nime asusu Igbo, nke bukwa asusu nkpokota puru iche nkem n`ahubeghi n`asusu ozo di n`okpuru anyanwu. Obukwa nganga ndi Igbo ebe obula. Nwa Igbo, karisia nwa-nwoke, nke namaghi ya abughi ezi nwa afo
Igbo.
Asusu mba bu otu nime ihe nketa kasi uku ha nwetara site n`aka onye kere uwa nke odighi mba ozo nwere ya. Iji ma atu: Onweghi ndi ozo n`elu uwa dum n`asu asusu igbo m`obughi ndi Igbo. Nkea putara na oburu na mba atufue asusu ya, otufuru oke ihe. Mba di otua tufuru aha ya n`ebe Chineke no, tufukwa onodu ya n`etiti mba ndi ozo.
Oburu na mba adota ibe ya n`agha, otu n`isi ihe mbu ha neme bu inapu mba ahu adotara n`agha asusu ha. Ngwa ngwa anapuru gi asusu gi, ihe oputara bu na ekpochapula agburu gi pua n`elu uwa. Odighikwa ihe obula aga eji cheta gi ozo.
Asusu onye bu ola edo ya, obukwa ori ona ya, obu ebe nzodo ukwu ya n`elu uwa, burukwa nani ihe nzuzo onwere nke mba ndi ozo n`amaghi. Eke kere uwa bu Chineke nke elu igwe, choo igosi gi na ya ma onye ibu maruo gi ulo, O were asusu gi gwa gi okwu. Oburukwa na inaga na obodo imaghi, inu asusu gi na mberede, aga akpote ako n`uche gi iju si, onye bu onye a n`asu asusu m.
Nwa n`aso asusu ya oyi
N`aso onwe ya oyi
Nwa n`aso onwe ya oyi
Amaghi onwe ya ma otu
Nwa n`amaghi onwe ya m`otu
Nwa ahu by onye iberibe
Nwa iberibe abughikwa madu

Obodo obula n`enweghi umu ntakiri adighikwa ndu, otu aka ahu, obodo obula nke umuntakiri ha namaghi asusu ha nwuru anwu. Umu ntakiri ahu bu oru nye ndi obula ha n`asu asusu ha.
N`ihi na nime asusu ndi ka ndu ha di. Nime asusu ndi ka omume na omenala ha si, nime asusu ndi ka echiche nile nke ha geji cheputa ezi ihe nile ha gejikwa we bie ndu di, nime asusu ka esi akpu nwata dika ite, nime ya ka esi amara ebe osi puta.
Onye obula asusu onye si mba ozo bu isi asusu ya, gamara na: ile anya ya, ikwu okwu ya, omume ya, ejiji ya, na otutu ihe ndi ozo ona eme gaburiri dika asusu ndi ahu si di.
Obu nkea mere obodo obula nke mara ihe ji echekwata asusu ha nke oma ma gba mbo me ka oghara inwu. Obodo obula nke asusu ha di ha nkpa, onwe ha na ala ha nadikwa ha nkpa. Asusu ndi bu ihe na okoloto nye ha.
Oko akuko ( olu n`aju ajuju ugbua) oburu n`asusu a di nkpa ma dikwa oke onu ahia otua, gini mere ihe banyere isu ya ugbua ji ala azu, karisia na ebe umu ntorobia no, ebe odoro anya na obodo obula n`enweghi asusu lara n`iyi?
Onye obia nkem, ajuju gi amaka ma nemetukwa n`obi. Ma tupu mza gi ya, buru uzo nuru nkea gi na ndi ozo no n`ebea.

Asusu mere mba
Mba di nime asusu
Omenala bidoro n`asusu
Omume mba dabere n`asusu ya
E, asusu mere mba.

Ebe ogba aghara nke asusu di
Obodo ahu no n`aghara nke omume
N`ihi n`asusu bu ngborogwu omume
Asusu k`eji ewube obodo
E, asusu bukwa nto ala obodo

Ebe obula, m`obu obodo obula madu m`obu umu ntakiri n`agbara asusu ha oso, nwere uzo ihe abuo gbara okpurukpu kpatara ya. Nke mbu bu na ndi ahu malitere iche na asusu ndi mba ozo ka nke ha nma, m`obu na obu asusu ndi ahu ka eji kee uwa. Nke abuo bu na nne na nna na ndi okenye ndi kwesiri ihu na asusu ahu di ndu leghara ya anya. Nke ozokwa di oke nkpa bu otu esiri dozie m`obu chikota mkpuru okwu edemede ya.
Ezigbo nto ala n`ihe obula mara nma di nkpa nke uku. Ya mere otu esi hazie mkpuru okwu edemede ji buru ihe di nkpa nke uku. Opuru ime ka nmuta asusu ga n`iru m`obu la azu. Odoro anya na otutu asusu di n`uwa malitere n`ihi na onye kere uwa ghagburu otu asusu di mgbe ahu we me ka oba uba, ihe nkea putara bu na site nime otu asusu ahu aghagburu, otu onye nwere ike imalite otu okwu nke putara otu ihe na asusu ndi ozo site na `A` onye ozo nwekwara ike n`asusu nke ya malite otu okwu ahu site na `B` m`obu `GB`. N`ihi nkea, otua ka nchikota mkpuru okwu edemede ha g`esi di ka owe gara ha nke oma.
Ihe iji ma atu: Asusu Igbo “Bia” bidoro na mkpuru okwu “B” otu okwu a putara n`asusu Hausa `Zo` na Yoruba `Wa`, na asusu Bekee o putara `Come` ihula na otu okwu ahu ka Chineke ghagburu otu esi ekwu ya, ma ihe ha nile putara ka bukwa otu ihe ahu. Otua ka mba ihe ndia gbasara si dozie mkpuru okwu edemede ha ka owe kwe ha nmuta.
Ndi doziri m`obu degharia mkpuru okwu edemede Igbo nke ikpe azu a gbaliri nke uku. Ha bu dike na amamihe na ndi choro ka asusu a naga n`iru. Ma odi otutu ihe nke di ya nke mere ka umu ntakiri anyi, bu ndi akwadoro ya nye ji agbara ya oso. Iji mata ihea nke oma k`anyi lee anya na usoro esi hazie mkpuru okwu edemede ndia:
A B CH D E F G GB GH
GW H I I J K KP KW L
M N N NW NY O O P R
S SH T U U V W Y Z

Otu esi chikota mkpuru okwu edemede a mere ka ukwe na ude kwesiri idi ya ko uko nime ya. Odighikwa nwata obula n`enwe nmasi nime ya. Nkea bu otu nime ihe mere ha ji agbara ya oso. N`ihi na rukwe ugbua, odighi nwanta obula igasi ya gua ya, ga aguta ya, otu aka ahu ha agaghi ede-nwu ya nke oma.
Ihe ozo di nkpa ebea bu na obughi iwu na mkpuru okwu edemede nile n`uwa g`ebido na `A` ma werekwa mkpuru okwu a bu `Z` kwusi. Onwere ndi mkpuru okwu edemede ha, dika asusu ha si di, bidoro na `Alfa` kwusikwa na `Omega`.
Ihe kpatara nkea bu na dika mkwuru na mbu, aghagburu asusu, we kpo ya isi ala, ndi obula si ebe osi dabara ha malite ikwu ihe ha g`anurita na etiti onwe ha. Ebe otu ndi n`ebido okwu na, iji ma atu `z` ndi ozo namalitekwa otu okwu ahu na `w`.
Anyi makwara nke oma na oburu na icho ka nwanta muta ihe ina akuzi ngwa ngwa, tinye ya m`obu me ya ka ogho egwu, ukwe m`obu abu.
Ngwa nye m nti ugbua kam guoro gi mkpuru okwu edemede a:

A B GB D E F
G GH H I I J
K L M N N O
O P KP R S SH
T U U V W Y
Z CH GW KW NW NY

Mkpuru okwu edemede a zuru oke. Onwere ukwe ma oburu na icho itinyere ya umuaka. Onwekwara ude. Nke bu na ona edede. Odigh nwanta obula ga agbara ya oso. Ndi chikotara ya na mgbe ochie bu ndi mara ihe, burukwa ndi cheruru echiche ala nke oma. Nezie okwu odighi ihe koro nime usoro mkpuru okwu edemede a, nke mekwara na odighi ihe koro n`asusu Igbo, karichasia ihe obula nke bu ihe ndi Igbo kwesiri iji we bie ndu ha nke oma. Oburu na ahapu mkpuru okwu edemede a otu ndi mgbe ochie siri do ya dika msiri do ha n`ebea, nke gosikwara na odighi ihe irimpe obula di ya, asusu anyi agagh anwu m`otu. Mgbe ahu umu ntakiri anyi g`eji onu na egwu makua ya, nihi na nmuta asusu mba nebido na ighota mkpuru okwu edemede ha.
Ihe ozokwa dika ajuju gi si di, nke neme odi ka asusu Igbo o nala azu sitere na aka ndi nkuzi na akuzi asusu Igbo. Odoro anya na obu ihe madu mara nke ome ka o gakuzikwa nke oma nye onye obula agu imuta ihe na agu, m`obu nye umu neto eto bu ndi choro imuta ya. Otutu nime ha amaghi ya nke oma, n`ihi ya odighikwa otu ha geji kuzie ya nke oma nye ndi madu.
Nke ozo sitere n`aka umu anyi ndi guru akwukwo n`ala Bekee. Ndi lotara we negosi n`asusu anyi ezughi oke na otutu aha ejiri asusu Igbo gua enweghi ihe a oputara. We ko ya onu na obu ihe ndi ime ohia na ndi na emepeghi emepe. Udi oyi ha soro asusu oma nke bukwa asusu ha n`asu tupu ha gawa ala Bekee, mere otutu ndi ozo ji soro ha namaghi ihe ha neme sowa asusu igbo oyi, ebe ha hutara ndia guru akwukwo dika ndi mara ihe.
Nsogbu ozo asusu Igbo a nenwe sitere n`aka ndi nwere ulo akwukwo nke aka ha. Ndia nenyekwa iwu si onye obula suru asusu igbo na ulo akwukwu ahu na o ganata utari na ntaram ahuhu. Ha amaghi na dika ndi dotata madu nagha, na ha nenye aka ebe odi uku ikpochapu asusu Igbo. Ebe ha na esite na nwa ntakiri eku na aka were asusu Bekee kuziwere ha ihe.
Nime ihe ka na onu ogugu na nzuko di iche iche ebea bu ala Igbo, ebe ano ekpere Chineke bu asusu Bekee ka ha ji eme ihe nile. Akwukwo nso bu Baibul nke Igbo ala la.Ekpere nile bu n`asusu Bekee. Ogabu na ndi ozi no na ha chere na Chineke anaghi anu asusu Igbo, m`obu n`asusu Igbo ruru aru n`anya Chineke. Ihere na emekwa ndi guru akwukwo ebea isu asusu ha. Umu ntorobia we sinu na obu ihe negosi nmepe na nmuta ihi na uwa nile bukwa otu obodo ugbua.
Gini ka ichere n`aga eme ka ewe loghachi na onodu mbu ahu?
Ndi nwe ulo akwukwo nke aka ha, na nke ndi obodo nwe n`otu, ndi ndu nke ulo uka, na ndi guru akwukwo ebea, ga amara na obu ihe aru na madu ichula asusu ya. Na onye mere nkea bu oru nye asusu obula ona asu nke n`abughi nke ya.
Ozo, ndia nwe ulo akwukwo nke aka ha, na nke ndi obodo, na ndi ndu nke ulo uka nile ebea, na ndi Eze odi n`ala, na ndi ndu obodo , gagboko onu nwe nkpebi, nyekwa ya dika iwu, na nwata akwukwo obula ga asuriri igbo ma dekwa ya ede, ihe ga adi nma.
Ozo, obodo obula, onuma obula na ala Igbo, ndi Eze, na ndi Ichie ga agbalisike, obughikwa ime ya dika iwu nani, kama ha g` kwusike si na onye obula si na ya bu nwa ha gamariri sua asusu Igbo, rue kwa ma na akpa-ala okwu. N`onye obula si na ya bu nwa anyi ma omaghi asusu anyi na omenala anyi abughi nwa anyi nezie. N`ihi na obu asusu ka eji ama ebe onye si.
Ezi onye obia m, ejim n`aka na asawo m gi ajuju gi ahu otu odi gi obi nma na otu okwekwara nghota. Ngwa zurutu nu ike nwa-mgbe nta.
Ugbua anyi loghachiri azu, agam agakwa n`iru ikoro unu n`otu isi okwu a ihe mere ndi Igbo jiri pua iche. Ihe ha n`alu, m`obu aka olu ha. Ihe mere mba ndi ozo jiri achosi ha ike.
Cha, cha, cha, cha, Igbo kwenu, kwenu, kwenu, kwezuonu!!!

Onye dire ya…. Ugo Nwoke

Facebook Comments

Leave a Comment