AKUKO EGWURIEGWU ASO’MU MPI BOOLU

AKUKO EGWURIEGWU ASO'MU MPI BOOL

NDEWONU NDI OMA N’ EGE NTI
O kuo la elekere asato nke ututu,
Ngwa gee nti nuru akuko uwa n’ uju ya:
.
Aha m bu nwaada Manchester United!  Itzdat Dopekid Juanpresh

Futu boolu klobu nke di n’ SPAIN, a kporo Barcelona etiela ndi Futu boolu klubu nke di n’ England akporo Chelsea Alika-akwu😲 n’ abali nyaaaa bu 14:03:2018.
.
Ndi a bu ndi akporo Barca ji iwe were gba ndi a bu “the Blues” okpu ato nke ha na-asataghi otu.
Nwa amadia di mkpukpu ma gbasie ike n’ ala nke a kporo Messiles Messi menyere ndi a bu Chelsea egwu ma si na agada oche goolu ha bu(goal keeper) ndi Chelsea wee pianye goolu abuo.
Ndi Futu boolu klobu a kporo onwe ha Blues jikwa iwe wee chara red’ ghara oche goolu ha, ripu oso ngwangwa refeeri gburu piiiiiii. ……….
Agba nke abuo
Ngwa geezie nti ka inuru ihe mere n’ etiti Di na Nwunye a bu mama ejima na papa ejima:
.
Papa ejima bu onye Blues ji iwe na onuma were bata, onweghi onye ofuru ihu ya makana obi elewago ya,
Mama ejima were juo ya si “Darling, nkea ihu gi di otua, mmadu anwuru? ”
Papa ejima bulitere ekwenti ya zaru koluu gaba n’ ezi, n’ eti mkpu n’ oke olu si “Which kind nonsense keeper b this, what kind of nonsense is this, if I go to work tomorrow now every body in the market will face me! After I don mek mouth finish, wetin I go do now”
Mama ejima were nwanyo gbachie uzo ya, were si ya tirizie mkpu jee choba ndi Chelsea ibe ya!
Okwanu otua ka nwa amadi siri lahu n’ iro. …

Onye isi ala anyi bu Prezident Mohammadu Buhari enyela ihu taa ma si, onye bula fie asaa n’ anya ma zoo onye Chelsea obula no na gburugburu gi ndu n’ ihi na akwukwu nso siri anyi buru onye nche nwanne anyi.
.
Ebe a ka akuko uwa nke taa ga abia n’ njedebe! !!
Ndewonu
A kam bukwa nwaada Manchester United
🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌🙌

Facebook Comments

Leave a Comment