Ndi iche di na Igbo Izugbe na Olumba

OKWU MMALITE
Asụsụ Igbo na asụsụ tọkarịrị na ụtọ ma maa mma na ntị ịnụ, ọbụ ihe ndị Igbo ji ekwurịta okwu ebe ọbụla ha nọ, mana ọbụ ihe mwute na ọtụtụ ndị nne na nna arụrụ ala ji aka ha achụla asụsụ Igbo.
Asụsụ Igbo nwere ihe nile ịchọrọ: ụda olu, ngwaa, ahịrịokwu, nkọwaaha, nnọchiaha, Ndakọrịta ụdaume…ma dịrị gabazie
Asụsụ Igbo nwere ụzọ ngalaba abụọ amaara ọfụma
*Igbo Izugbe [Central Igbo]
*Igbo Olumba [native Igbo]
Ngwa gee ntị ka ihu ihe dị iche na ha abụọ

IGBO IZUGBE [Central Igbo]
Igbo Izugbe bụ Igbo pụrụ iche ndị Igbo nile ji ekwurịta okwu, ọbụ ya ka ndị mba ọzọ jiri mara ndị Igbo nile gbaa gburugburu, ọ na-enwe nghọta zuru okè ma tọọ ụtọ na ntị. Onye mba n’abụghi onye ga-eji ya mụọ asụsụ Igbo.
NJIRIMARA IGBO IZUGBE
[1] Ọ n’adị mfe ịmụta
[2] Ọ n’adị mfe na nghọta
[3] Ọbụ ya ka eji akụzi Igbo n’ụlọ akwụkwọ
[4] Ọbụ ya ka ndị ode akwụkwọ ji akwụkwọ Igbo
[5] Ọbụ ya ka eji ede Igbo n’ule akwụkwọ
[6] Ọ n’adị mfe na nsupe

IGBO OLUMBA [native Igbo]
Ọtụtụ obodo dị n’ala Igbo nwere ire dị iche iche nke obodo ndị ọzọ agaghị aghọta ọfụma: ọbụ ya ka a n’akpọ Olumba(olu ndi). Olumba nwere ihe mgbagwoju anya nke bụ na onye Umuchu agaghị aghọta ihe onye Arọchukwu n’asụ, onye Abakaliki agaghị aghọta ihe onye Ngwa n’asụ, ọbụ ya mere na anabataghị ya na uto asụsụ Igbo
NJIRIMARA IGBO OLUMBA
[1] Onaghị atọ ụtọ n’ọnụ
[2] Onaghị atọ ide ede
[3]Ọ na-ara ahụ mmụta
[4] Anaghị eji ya ede Igbo
[5] Onaghị enwe ezigbo ahịrịokwu zuru oke.

Maazị Obiọra Chukwudubem:  MAHADUM OSNI

Facebook Comments

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

WP2Social Auto Publish Powered By : XYZScripts.com